Ndị Ikpe 20:19
Judges 20:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị agha ụmụ Izrel niile buliri ihe agha ha pụọ, maa ụlọ ikwu ha nso nso Gibea.
Judges 20:19 in English
Judges 20:19 · Berean Standard Bible
The next morning the Israelites set out and camped near Gibeah.
Context
17Ma ọnụọgụgụ ndị agha ụmụ Izrel, ma ọ bụrụ na e wezuga ụmụ Benjamin, dị narị puku anọ. 18Ma tupu agha ahụ ebido, ndị agha Izrel buru ụzọ gaa Betel ịjụta Chineke ase. Ha jụrụ ya sị, “Olee ebo ga-edu anyị ibuso ndị agha Benjamin agha?”
Onyenwe anyị zara sị ha na ọ bụ Juda ga-ebu ụzọ. 19Nʼihi nke a, nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị agha ụmụ Izrel niile buliri ihe agha ha pụọ, maa ụlọ ikwu ha nso nso Gibea. 20Emesịa, ndị Izrel pụrụ izute ndị Benjamin, doo onwe ha nʼusoro ibu agha na Gibea. 21Ma nʼụbọchị ahụ, ndị Benjamin si Gibea nupụta nʼigwe gbuo ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ na puku abụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.