Native Bible

Judges 2:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nke a, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Izrel, ma sị, “Nʼihi na mba a emebiela ọgbụgba ndụ ahụ m nyere nna ha nʼiwu, jụkwa ige m ntị,

Judges 2:20 in English

Judges 2:20 · Berean Standard Bible

So the anger of the LORD burned against Israel, and He said, “Because this nation has transgressed the covenant I laid down for their fathers and has not heeded My voice,

Context

18Ma mgbe ọbụla Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel onye ikpe, ọ na-anọnyere onye ikpe ahụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Ọ na-esitekwa nʼaka onye ikpe a napụta ụmụ Izrel nʼaka ndị iro ha nʼihi na Onyenwe anyị nwere obi ebere nʼahụ ụmụ Izrel, mgbe ha na-asụ ude, nʼihi mmegbu na mkpagbu niile ndị iro ha na-emegbu ha, ma na-akpagbukwa ha. 19Ma mgbe ọbụla onye ikpe a nwụrụ, ụmụ Izrel na-alaghachi azụ biwe ndụ ọjọọ karịa nke nna nna ha ochie. Ha na-agbaso chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala nye ha, na ife ha ofufe. Ha jụrụ iwezuga agwa ọjọọ ha ndị a ma ọ bụkwa ụzụ isiike ha. 20Nʼihi nke a, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Izrel, ma sị, “Nʼihi na mba a emebiela ọgbụgba ndụ ahụ m nyere nna ha nʼiwu, jụkwa ige m ntị, 21agaghị m achụpụkwa site nʼihu ha mba ndị ahụ Joshua hapụrụ mgbe ọ nwụrụ. 22Aga m eji ha nwalee Izrel, ịchọpụta ma ha ga-elezi anya idebe ụzọ Onyenwe anyị, gaakwa ije nʼime ya dịka nna nna ha mere m.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.