Ndị Ikpe 19:21
Judges 19:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya. O duuru ịnyịnya ibu ha, nye ha ihe oriri. Emesịa, ha sara ụkwụ* ha mmiri, nọdụ ala rie ma ṅụọkwa.
Judges 19:21 in English
Judges 19:21 · Berean Standard Bible
So he brought him to his house and fed his donkeys. And they washed their feet and ate and drank.
Context
19Anyị nwere ihe oriri nke ịnyịnya ibu anyị ga-eri, achịcha na mmanya nke anyị bụ ndị ohu gị ga-eri, ya bụ, mụ onwe m na ohu gị nwanyị na nwokorobịa so anyị. Anyị achọghị ihe ọbụla nʼaka onye ọbụla.” 20Agadi nwoke ahụ sịrị ha, “Batanụ nʼụlọ m dịka ndị ọbịa nke m. Ka m nye unu ihe niile bụ mkpa unu. Naanị unu anọla ọnọdụ abalị nʼama.” 21Nʼihi nke a, ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya. O duuru ịnyịnya ibu ha, nye ha ihe oriri. Emesịa, ha sara ụkwụ* ha mmiri, nọdụ ala rie ma ṅụọkwa. 22Ma mgbe ha risiri nri, nọrọ na-ezu ike, na-akpakọrịta ụka, na mberede, ndị ikom ụfọdụ sitere nʼobodo ahụ, ndị jọgburu onwe ha nʼomume gbara ụlọ ahụ gburugburu. Ha malitekwara iti aka nʼụzọ ahụ na iti mkpu na-akpọku agadi nwoke ahụ, sị ya, “Kpọpụta onye ọbịa ahụ nọ nʼime ụlọ gị ka anyị mara ya.” 23Agadi nwoke ahụ bụ onyenwe ụlọ ahụ pụkwuuru ha nʼezi, sị ha, “Biko ụmụnna m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a. Nwoke a nọ nʼụlọ m dịka ọbịa. Unu emela ihe ihere dị otu a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.