Ndị Ikpe 18:19
Judges 18:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha zara sị ya, “Mechie ọnụ gị! Ekwukwala okwu ọbụla. Soro anyị bịa bụrụ nna anyị na onye nchụaja anyị. Ọ ga-abara gị uru karịa ịbụ onye nchụaja nye otu ebo na otu agbụrụ nʼIzrel, karịa ịbụ onye nchụaja nke naanị otu nwoke nʼime ezinaụlọ ya.”
Judges 18:19 in English
Judges 18:19 · Berean Standard Bible
“Be quiet,” they told him. “Put your hand over your mouth and come with us and be a father and a priest to us. Is it better for you to be a priest for the house of one person or a priest for a tribe and family in Israel?”
Context
17Mgbe ahụ, ndị nnyocha ise ahụ banyere nʼime ụlọ ahụ buru arụsị ọla ahụ, na efọọd ahụ, na arụsị ezinaụlọ ndị ahụ, ma onye nchụaja ahụ na narị ndị agha isii ndị ji ngwa agha guzo nʼọnụ ụzọ ama. 18Mgbe ndị ikom ahụ banyere nʼụlọ Maịka buru arụsị ọla ahụ, efọọd ahụ na arụsị ezinaụlọ ndị ọzọ ahụ, onye nchụaja ahụ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-eme?” 19Ha zara sị ya, “Mechie ọnụ gị! Ekwukwala okwu ọbụla. Soro anyị bịa bụrụ nna anyị na onye nchụaja anyị. Ọ ga-abara gị uru karịa ịbụ onye nchụaja nye otu ebo na otu agbụrụ nʼIzrel, karịa ịbụ onye nchụaja nke naanị otu nwoke nʼime ezinaụlọ ya.” 20Mgbe ahụ, obi tọrọ nwokorobịa onye nchụaja ahụ ụtọ isoro ha gaa. O buuru efọọd ahụ, arụsị ezinaụlọ ndị ọzọ ahụ na oyiyi ahụ a pịrị apị soro ndị ahụ gawa. 21Ha malitekwara ije ha, ụmụntakịrị ha, na igwe anụ ụlọ ha, na ngwongwo ha ka ha tinyere nʼihu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.