Native Bible

Judges 17:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu nwokorobịa onye Livayị, sitere nʼobodo Betlehem nke dị na Juda, bụ onye binyere ndị agbụrụ Juda,

Judges 17:7 in English

Judges 17:7 · Berean Standard Bible

And there was a young Levite from Bethlehem in Judah who had been residing within the clan of Judah.

Context

5Nwoke ahụ bụ Maịka nwere ụlọ arụsị, o mere efọọd na arụsị ezinaụlọ* dị iche iche, mee otu nʼime ụmụ ya ndị ikom ka ọ bụrụ onye nchụaja ya. 6Nʼụbọchị ndị a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼihi nke a, onye ọbụla na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ, na ihe ọbụla dị ya mma nʼanya. 7Otu nwokorobịa onye Livayị, sitere nʼobodo Betlehem nke dị na Juda, bụ onye binyere ndị agbụrụ Juda, 8hapụrụ obodo ahụ, bụ Betlehem Juda ịchọ ọnọdụ nʼebe ọzọ. Mgbe ọ na-aga, ọ bịaruru nʼụlọ Maịka nʼala ugwu ugwu Ifrem. 9Maịka jụrụ ya, “Ebee ka i si bịa?” Ọ sịrị “Abụ m onye Livayị si Betlehem dị na Juda. Ana m achọrọ onwe m ebe m ga-anọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.