Native Bible

Judges 17:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nwoke ahụ bụ Maịka nwere ụlọ arụsị, o mere efọọd na arụsị ezinaụlọ* dị iche iche, mee otu nʼime ụmụ ya ndị ikom ka ọ bụrụ onye nchụaja ya.

Judges 17:5 in English

Judges 17:5 · Berean Standard Bible

Now this man Micah had a shrine, and he made an ephod and some household idols, and ordained * one of his sons as his priest.

Context

3Mgbe o nyeghachiri nne ya puku na narị ego ọlaọcha shekel ahụ, nne ya gwara ya sị, “Ana m edo ọlaọcha ndị a nsọ nye Onyenwe anyị nʼihi nwa m nwoke maka iji ya mee oyiyi a pịrị apị na arụsị a kpụrụ akpụ. Aga m emesịa nyeghachi gị ya.” 4Ya mere, o nyeghachiri nne ya ọlaọcha ahụ, Nne ya weere narị ego ọlaọcha shekel abụọ wegara ọkpụ ụzụ ọlaọcha, onye jiri ya mee oyiyi a pịrị apị na ihe a kpụrụ akpụ. E tinyere ha nʼụlọ Maịka. 5Nwoke ahụ bụ Maịka nwere ụlọ arụsị, o mere efọọd na arụsị ezinaụlọ* dị iche iche, mee otu nʼime ụmụ ya ndị ikom ka ọ bụrụ onye nchụaja ya. 6Nʼụbọchị ndị a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼihi nke a, onye ọbụla na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ, na ihe ọbụla dị ya mma nʼanya. 7Otu nwokorobịa onye Livayị, sitere nʼobodo Betlehem nke dị na Juda, bụ onye binyere ndị agbụrụ Juda,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.