Ndị Ikpe 16:5
Judges 16:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị eze ndị Filistia,* bịakwutere Delaịla rịọọ ya sị, “Gbalịa lee ma ị ga-enwe ike chọpụta ebe ike Samsin si abịa, ka anyị nwee ike ịmata ụzọ anyị ga-esi jide ya, kee ya agbụ. Ọ bụrụ na i meere anyị nke a, anyị na-ekwe nkwa na onye ọbụla nʼime anyị ga-enye gị puku shekel na narị shekel ọlaọcha.”*
Judges 16:5 in English
Judges 16:5 · Berean Standard Bible
The lords of the Philistines went to her and said, “Entice him and find out the source of his great strength and how we can overpower him to tie him up and subdue him. Then each one of us will give you eleven hundred shekels of silver.*”
Context
3Ma Samsin dinara nʼụlọ nwanyị akwụna ahụ ruo nʼetiti abalị ahụ. Mgbe ọ pụtara, ọ gara ruo nʼọnụ ụzọ obodo ahụ, foro ibo ọnụ ụzọ obodo ahụ, ya na ibo ya abụọ, bukwasị ya nʼubu ya, buru ha gaa nʼelu ugwu chere obodo Hebrọn ihu. 4Ọ dịghị anya, Samsin hụrụ otu nwaagbọghọ, onye ọ hụrụ nʼanya. Aha nwaagbọghọ a bụ Delaịla, onye si nʼobodo dị na Ndagwurugwu Sorek. 5Ndị eze ndị Filistia,* bịakwutere Delaịla rịọọ ya sị, “Gbalịa lee ma ị ga-enwe ike chọpụta ebe ike Samsin si abịa, ka anyị nwee ike ịmata ụzọ anyị ga-esi jide ya, kee ya agbụ. Ọ bụrụ na i meere anyị nke a, anyị na-ekwe nkwa na onye ọbụla nʼime anyị ga-enye gị puku shekel na narị shekel ọlaọcha.”* 6Nʼihi nke a, Delaịla gwara Samsin okwu sị ya, “Gwa m ebe ike gị si abịa. Gwakwa m otu mmadụ pụrụ isi kee gị agbụ, merie gị.” 7Mgbe ahụ, Samsin zara sị ya, “Ọ bụrụ na mmadụ e jiri akwara eriri asaa dị ọhụrụ, ndị a na-amịkpọghị amịkpọ kee m, m ga-abụkwa onye na-adịghị ike dịka mmadụ ọbụla ọzọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.