Ndị Ikpe 16:3
Judges 16:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Samsin dinara nʼụlọ nwanyị akwụna ahụ ruo nʼetiti abalị ahụ. Mgbe ọ pụtara, ọ gara ruo nʼọnụ ụzọ obodo ahụ, foro ibo ọnụ ụzọ obodo ahụ, ya na ibo ya abụọ, bukwasị ya nʼubu ya, buru ha gaa nʼelu ugwu chere obodo Hebrọn ihu.
Judges 16:3 in English
Judges 16:3 · Berean Standard Bible
But Samson lay there only until midnight, when he got up, took hold of the doors of the city gate and both gateposts, and pulled them out, bar and all. Then he put them on his shoulders and took them to the top of the mountain overlooking Hebron.
Context
1Otu ụbọchị, Samsin gara nʼotu obodo ndị Filistia a na-akpọ Gaza, soro otu nwanyị akwụna bi nʼebe ahụ hie ụra abalị. 2A gwara ndị Gaza sị, “Samsin nọ nʼobodo a.” Nʼihi ya, ha gbara ebe ahụ gburugburu ma nọdụ na-eche nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ abalị niile. Ọ dịghị ihe ha mere nʼabalị ahụ nʼihi na ha zubere sị, “Mgbe chi bọrọ, anyị ga-egbu ya.” 3Ma Samsin dinara nʼụlọ nwanyị akwụna ahụ ruo nʼetiti abalị ahụ. Mgbe ọ pụtara, ọ gara ruo nʼọnụ ụzọ obodo ahụ, foro ibo ọnụ ụzọ obodo ahụ, ya na ibo ya abụọ, bukwasị ya nʼubu ya, buru ha gaa nʼelu ugwu chere obodo Hebrọn ihu. 4Ọ dịghị anya, Samsin hụrụ otu nwaagbọghọ, onye ọ hụrụ nʼanya. Aha nwaagbọghọ a bụ Delaịla, onye si nʼobodo dị na Ndagwurugwu Sorek. 5Ndị eze ndị Filistia,* bịakwutere Delaịla rịọọ ya sị, “Gbalịa lee ma ị ga-enwe ike chọpụta ebe ike Samsin si abịa, ka anyị nwee ike ịmata ụzọ anyị ga-esi jide ya, kee ya agbụ. Ọ bụrụ na i meere anyị nke a, anyị na-ekwe nkwa na onye ọbụla nʼime anyị ga-enye gị puku shekel na narị shekel ọlaọcha.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.