Ndị Ikpe 12:1
Judges 12:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ndị Ifrem kpọkọtara ndị agha ha na Zafọn zigara Jefta ozi sị ya, “Gịnị mere ị kpọghị anyị ka anyị bịa nyere gị aka ịlụso ndị Amọn agha? Anyị na-abịa iwere ọkụ irechapụ gị na ezinaụlọ gị.”
Judges 12:1 in English
Judges 12:1 · Berean Standard Bible
Then the men of Ephraim assembled and crossed the Jordan to Zaphon. They said to Jephthah, “Why have you crossed over to fight the Ammonites without calling us to go with you? We will burn your house down with you inside!”
Context
1Mgbe ahụ, ndị Ifrem kpọkọtara ndị agha ha na Zafọn zigara Jefta ozi sị ya, “Gịnị mere ị kpọghị anyị ka anyị bịa nyere gị aka ịlụso ndị Amọn agha? Anyị na-abịa iwere ọkụ irechapụ gị na ezinaụlọ gị.” 2Jefta zaghachiri ha sị, “Akpọrọ m unu mgbe mụ na ndị m na ndị Amọn na-ese okwu dị ukwu ma unu jụrụ ịbịa. Unu azọpụtaghị m site nʼaka ha. 3Mgbe m hụrụ na unu achọghị inyere anyị aka, e tinyere m ndụ m nʼaka m, gabiga nʼofe nke ọzọ ibuso ndị Amọn agha. Ma Onyenwe anyị nyeere m aka imeri ha. Ugbu a, nʼihi gịnị ka unu ji bịa ịlụso m ọgụ taa?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.