Ndị Ikpe 1:34
Judges 1:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma banyere ndị ebo Dan, ndị Amọrait chụpụrụ ha chụba ha nʼelu ugwu. Ha ekwenyeghị ka ha rịdata na ndịda ugwu ahụ.
Judges 1:34 in English
Judges 1:34 · Berean Standard Bible
The Amorites forced the Danites into the hill country and did not allow them to come down into the plain.
Context
32Ndị Asha binyere nʼetiti ndị Kenan bụ ndị bi nʼala ahụ, nʼihi na ha achụpụghị ha. 33Ndị ebo Naftalị achụpụghịkwa ndị bi na Bet-Shemesh, maọbụ ndị bi na Bet-Anat. Kama ndị Naftalị binyere ndị Kenan bi nʼala ahụ. Ma ndị bi na Bet-Shemesh, na Bet-Anat ghọrọ ndị ohu ndị Naftalị. 34Ma banyere ndị ebo Dan, ndị Amọrait chụpụrụ ha chụba ha nʼelu ugwu. Ha ekwenyeghị ka ha rịdata na ndịda ugwu ahụ. 35Ma ndị Amọrait nọgidesịrị ike nʼugwu Heres, na Aijalon, na Shaalbim, ma mgbe ike ebo Josef bara ụba, ha meriri ha, mee ha ndị ohu ha. 36Oke ala ụmụ ndị Amọrait malitere na mgbago Akrabim ruo, ma gafeekwa ebe a na-akpọ Sela.
1:3 Ebo Simiọn na ebo Juda si nʼagbụrụ Lịa Nkp 1:17
1:6 I gbupụ isi mkpụrụ aka, na mkpịsịụkwụ nke ndị e jidere nʼagha, bụ ihe a na-ejighị kpọrọ ihe na mba ndị dị nʼetiti ọwụwa anyanwụ. Mgbe e gbupụrụ isi mkpụrụ aka na mkpịsịụkwụ onye agha, onye dị otu a agaghị e nwe ike jide ngwa agha ọzọ, maọbụ gaa ije.
1:7 Ala Kenan bụ mba e kewara na mpaghara na mpaghara, maọbụ nʼobodo nta nʼobodo nta. Mpaghara, maọbụ obodo nta ọbụla nwere eze na-achị ya. Ọtụtụ obodo ndị a gbara isi obodo ahụ gburugburu.
1:16 Nke a bụ Jeriko
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.