Jemis 4:7
James 4:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nʼebe unu nọ gbapụ.
James 4:7 in English
James 4:7 · Berean Standard Bible
Submit yourselves, then, to God. Resist the devil, and he will flee from you.
Context
5Unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ na-ekwu nʼefu mgbe ọ na-asị, “Chineke na-ekwosi ekworo ike nʼihi Mmụọ Nsọ ya nke o mere ka o biri nʼime anyị.” 6Ma ọ na-enye anyị amara karịa. Ya mere, Akwụkwọ nsọ ji sị,
“Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu,
ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”* 7Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nʼebe unu nọ gbapụ. 8Bịakwutenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị obi abụọ. 9Ruonụ ụjụ, tienụ aka nʼobi nʼọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru ụjụ werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.