Native Bible

James 4:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi na ịkpa nganga. Ụdị ịnya isi a bụ ihe ọjọọ.

James 4:16 in English

James 4:16 · Berean Standard Bible

As it is, you boast in your proud intentions. All such boasting is evil.

Context

14Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo. 15Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị ga-adị ndụ, mee nke a maọbụ nke ọzọ.” 16Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi na ịkpa nganga. Ụdị ịnya isi a bụ ihe ọjọọ. 17Ya mere, mmadụ ọbụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie. 4:6 Ilu 3:34

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.