Native Bible

James 3:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ ya ka anyị ji eto Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ya ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nʼoyiyi nke ya.

James 3:9 in English

James 3:9 · Berean Standard Bible

With the tongue we bless our Lord and Father, and with it we curse men, who have been made in God’s likeness.

Context

7Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na nnụnụ, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri; 8ma mmadụ ọbụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire. Ọ bụ ihe dị oke njọ na-adịghị ekwe nchịkọta, ma jupụtakwa na nsi na-ebute ọnwụ. 9Ọ bụ ya ka anyị ji eto Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ya ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nʼoyiyi nke ya. 10Site nʼotu ọnụ anyị ka ịja mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a abụghị ihe ziri ezi. 11Ọ bụ ihe pụrụ ime na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ na mmiri nnu ga-esite nʼotu isi iyi ahụ na-asọpụta?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.