Jemis 3:2
James 3:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na anyị niile na-asọ ngọngọ site nʼọtụtụ ụzọ. Ma onye ọbụla nke na-adịghị emehie site nʼikwuhie ọnụ bụ onye tozuru oke na onye pụrụ ijide anụ ahụ ya niile aka.
James 3:2 in English
James 3:2 · Berean Standard Bible
We all stumble in many ways. If anyone is never at fault in what he says, he is a perfect man, able to control his whole body.
Context
1Ụmụnna m, ka ọtụtụ nʼime unu hapụ ịgbalị ịbụ ndị ozizi, nʼihi na unu maara na anyị bụ ndị ozizi ka a ga-ekpe ikpe nʼọnọdụ sikarịrị ike. 2Nʼihi na anyị niile na-asọ ngọngọ site nʼọtụtụ ụzọ. Ma onye ọbụla nke na-adịghị emehie site nʼikwuhie ọnụ bụ onye tozuru oke na onye pụrụ ijide anụ ahụ ya niile aka. 3Ọ bụrụ na anyị e tinye mkpụmkpụ igwe e ji ekechi ọnụ ịnyịnya ibu nʼọnụ ya, ka o rubere anyị isi, anyị na-eduru ya gaa ebe anyị chọrọ. 4Otu a kwa, ọ bụladị ụgbọ mmiri buru ibu nke ikuku dị ike na-ebugharị nʼosimiri, ka onye na-anya ụgbọ mmiri pụrụ ime ka ọ gaa ebe ọ chọrọ site nʼịtụgharịa ụmara ntakịrị e ji anya ụgbọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.