Jemis 3:15
James 3:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nʼeluigwe bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa. Ọ bụghị nke mmụọ nsọ. Ọ bụ nke mmụọ ọjọọ.
James 3:15 in English
James 3:15 · Berean Standard Bible
Such wisdom does not come from above, but is earthly, unspiritual, demonic.
Context
13Ọ dị onye ọbụla nʼime unu na-agụ onwe ya dị ka onye maara ihe na onye nwere nghọta? Ya gosi amamihe ya na nghọta ya site nʼibi ezi ndụ na ịrụ ọrụ ọma site nʼobi dị umeala. 14Ma ọ bụrụ na obi unu ejupụta nʼihe ilu na ekworo na ịchọ naanị ihe nke onwe unu, mgbe ahụ, unu ekwesighị ịnya isi sị otu a na-agọnarị eziokwu. 15Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nʼeluigwe bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa. Ọ bụghị nke mmụọ nsọ. Ọ bụ nke mmụọ ọjọọ. 16Nʼihi nʼebe ọbụla obi ilu na ekworo dị, ebe ahụ ka ọgbaaghara na omume ọjọọ niile dị. 17Ma amamihe na-esite nʼeluigwe abịa bụrụ ụzọ dị ọcha, emesịa, ọ hụrụ udo nʼanya, ọ na-eme obiọma, o jupụtara nʼebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịghịkwa nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.