Jemis 2:21
James 2:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ na nna anyị Ebraham abụghị onye a gụrụ nʼonye ezi omume site nʼọrụ ya, mgbe o jiri otu nwa ya bụ Aịzik chụọ aja nʼebe ịchụ aja?
James 2:21 in English
James 2:21 · Berean Standard Bible
Was not our father Abraham justified by what he did when he offered his son Isaac on the altar?
Context
19I kweere na ọ bụ naanị otu Chineke, i mere nke ọma, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kweere ma kụja. 20Gị onye nzuzu, ị na-achọ ka e gosi gị na okwukwe bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ e soghị ya? 21Ọ bụ na nna anyị Ebraham abụghị onye a gụrụ nʼonye ezi omume site nʼọrụ ya, mgbe o jiri otu nwa ya bụ Aịzik chụọ aja nʼebe ịchụ aja? 22Unu ahụghị na okwukwe ya na ọrụ soro rụkọọ nʼotu, e sitekwara nʼọrụ ya mee ka okwukwe ya zuo oke. 23Ọ bụ site na nke a ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri mezuo, nke na asị, “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume,”* kpọọkwa ya enyi Chineke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.