Aịzaya 7:6
Isaiah 7:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ka anyị wakpo Juda, ka anyị dọwaa ya ma kee ya nʼetiti onwe anyị, mee nwa Tabeel ka ọ bụrụ eze ya.”
Isaiah 7:6 in English
Isaiah 7:6 · Berean Standard Bible
‘Let us invade Judah, terrorize it, and divide it * among ourselves. Then we can install the son of Tabeal over it as king.’
Context
4Gwa ya ka ọ ghara inye ndụ ya nsogbu, ka ọ gharakwa ịtụ egwu. Sị ya, ‘Lezie anya, nọ jụụ, echegbula onwe ya banyere icheku ọkụ abụọ ahụ na-anyụ anyụ. Atụla egwu nʼihi iwe Rezin nwa Aram, na iwe Peka nwa Remalaya. 5E, Aram, na Ifrem, na nwa nwoke Remalaya, agbaala izu ibuso gị agha ịla gị nʼiyi. Ha ekwuola sị, 6“Ka anyị wakpo Juda, ka anyị dọwaa ya ma kee ya nʼetiti onwe anyị, mee nwa Tabeel ka ọ bụrụ eze ya.” 7Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Ọ gaghị adị ire!
Ọ gaghị emezukwa. 8Nʼihi isi obodo Aram bụ Damaskọs.*
Onyeisi Damaskọs bụ naanị Rezin.
Ma tupu afọ iri isii na ise agafee
a ga-etikpọkwa Ifrem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.