Aịzaya 63:18
Isaiah 63:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ naanị nwa oge nta ka ndị gị nwetara ebe nsọ gị, ma ugbu a, ndị iro anyị azọdala ebe nsọ gị.
Isaiah 63:18 in English
Isaiah 63:18 · Berean Standard Bible
For a short while Your people possessed Your holy place, but our enemies have trampled Your sanctuary.
Context
16Ma gị onwe gị, bụ Nna anyị,
a sịkwarị na Ebraham amaghị anyị
maọbụ Izrel agọnarị anyị,
gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Nna anyị,
onye Mgbapụta anyị ka ị na-azakwa siterị na mgbe ochie. 17Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eme ka anyị si nʼụzọ gị kpafuo
na-eme ka obi anyị sie ike otu a, na anyị adịghị atụ egwu gị?
Lọghachi nʼihi ndị ohu gị,
nʼihi ebo ndị ahụ bụ ihe nketa gị. 18Ọ bụ naanị nwa oge nta ka ndị gị nwetara ebe nsọ gị,
ma ugbu a, ndị iro anyị azọdala ebe nsọ gị. 19Anyị bụ nke gị site na mgbe ochie,
ma ị naghị achị nʼebe ha nọ,
ha bụ ndị a na-akpọkwasịghịkwa aha gị.
63:1 Maọbụ, mmeri
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.