Aịzaya 61:1
Isaiah 61:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi, ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha, na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ.*
Isaiah 61:1 in English
Isaiah 61:1 · Berean Standard Bible
The Spirit of the Lord GOD is on Me, because the LORD has anointed Me to preach good news to the poor. He has sent Me to bind up the brokenhearted, to proclaim liberty to the captives and freedom to the prisoners,*
Context
1Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m,
nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ
ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye.
O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi,
ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha,
na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ.* 2O zitere m ikwupụta afọ mgbe Onyenwe anyị ga-eji ihuọma leta ndị mmadụ,
na ụbọchị ịbọ ọbọ nke Chineke anyị.
O zitekwara m ịkasị ndị niile na-eru ụjụ obi, 3na igboro ndị niile na-eru ụjụ na Zayọn ihe na-akpa ha.
O zitere m inye ha okpueze mara mma
nʼọnọdụ ntụ,
inye ha ọṅụ,
nʼọnọdụ ịkwa akwa,
na iyikwasị ha mmụọ otuto
nʼọnọdụ mmụọ ịda mba.
Nʼihi na Chineke akụọla ezi omume nʼime ha,
dịka osisi ook siri ike,
igosi ịma mma Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.