Aịzaya 6:9
Isaiah 6:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ siri, “Gaa gwa ndị a sị, “ ‘Na-anụnụ, ma unu aghọtala, na-elenụ anya ma unu ahụla.*’
Isaiah 6:9 in English
Isaiah 6:9 · Berean Standard Bible
And He replied: “Go and tell this people, ‘Be ever hearing, but never understanding; be ever seeing, but never perceiving.’*
Context
7O weere icheku ọkụ ahụ sọtụ m nʼọnụ, sị m, “Ugbu a, a gụọla gị dịka onye dị ọcha, nʼihi na icheku a emetụla gị nʼọnụ. A gbagharakwala gị mmehie gị niile.” 8Mgbe ahụ, anụrụ m olu Onyenwe anyị ka ọ na-ajụ, “Onye ka m ga-eziga? Onye ga-ejekwara anyị?”
Asịrị m, “Lee m, ziga m.” 9Ọ siri, “Gaa gwa ndị a sị,
“ ‘Na-anụnụ, ma unu aghọtala,
na-elenụ anya ma unu ahụla.*’ 10Mee ka obi ndị a maa abụba, dịkwa arọ,*
mee ka ntị ha kpọchie,
mechiekwa anya ha.
Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ,
jiri ntị ha nụ ihe,
jirikwa obi ha ghọta,
ma chigharịa bụrụ ndị a gwọrọ.” 11Ma ekwuru m sị, “Onyenwe m, ọ bụ ruo ole mgbe?”
Ọ zara,
“Ọ bụ ruo mgbe obodo ha tọgbọrọ nʼefu,
mgbe ọ na-adịghị onye ga-afọdụ nʼime ya;
mgbe ụlọ obibi ha niile ga-atọgbọrọ nʼefu,
mgbe e bibisịrị ala ubi ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.