Native Bible

Isaiah 54:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ. Ị gaghị abụkwa onye e wedara nʼala. Ị gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe ị bụ nwantakịrị, na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị.

Isaiah 54:4 in English

Isaiah 54:4 · Berean Standard Bible

Do not be afraid, for you will not be put to shame; do not be intimidated, for you will not be humiliated. For you will forget the shame of your youth and will remember no more the reproach of your widowhood.

Context

2“Mee ka ebe ụlọ ikwu gị saa mbara, gbasapụ akwa mgbochi ụlọ ikwu gị, egbochila gbasapụ aka; mee ka ụdọ gị dị ogologo, meekwa ka o sie ike nke ọma. 3Nʼihi na nʼaka nri na nʼaka ekpe ka ị ga-agbasa gaa; ụmụ gị ga-achụpụ mba dị iche iche site nʼala ha, bichikwaa nʼobodo ha niile dakpọsịrị adakpọsị, nke tọgbọrọ nʼefu. 4“Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ. Ị gaghị abụkwa onye e wedara nʼala. Ị gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe ị bụ nwantakịrị, na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị. 5Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị, Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya. 6Nʼihi na Onyenwe anyị ga-akpọghachi gị dịka a ga-asị na ị bụ nwunye a hapụrụ ahapụ, nke ọ na-ewutakwa nʼime mmụọ ya bụ nwunye alụtara na nwantakịrị, naanị ka ọ bụrụ onye ajụrụ ajụ,” ka Chineke gị na-ekwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.