Aịzaya 54:2
Isaiah 54:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mee ka ebe ụlọ ikwu gị saa mbara, gbasapụ akwa mgbochi ụlọ ikwu gị, egbochila gbasapụ aka; mee ka ụdọ gị dị ogologo, meekwa ka o sie ike nke ọma.
Isaiah 54:2 in English
Isaiah 54:2 · Berean Standard Bible
“Enlarge the site of your tent, stretch out the curtains of your dwellings, do not hold back. Lengthen your ropes and drive your stakes in deep.*
Context
1“Bụọ abụ, gị nwanyị aga,
gị onye na-amụtaghị nwa;
tie mkpu ọṅụ, tiwakwaa olu abụ,
gị onye ime nwa na-emetụbeghị;
nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ
karịa ụmụ nke nwanyị nwere di,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 2“Mee ka ebe ụlọ ikwu gị saa mbara,
gbasapụ akwa mgbochi ụlọ ikwu gị,
egbochila gbasapụ aka;
mee ka ụdọ gị dị ogologo,
meekwa ka o sie ike nke ọma. 3Nʼihi na nʼaka nri na nʼaka ekpe ka ị ga-agbasa gaa;
ụmụ gị ga-achụpụ mba dị iche iche site nʼala ha,
bichikwaa nʼobodo ha niile dakpọsịrị adakpọsị, nke tọgbọrọ nʼefu. 4“Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ.
Ị gaghị abụkwa onye e wedara nʼala.
Ị gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe ị bụ nwantakịrị,
na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.