Aịzaya 44:26
Isaiah 44:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
onye na-eme ka okwu ndị ohu ya mezuo meekwa ka amụma ndị ozi ya buru mezuo, onye na-asị banyere Jerusalem, ‘A ga-ebikwa nʼime ya ọzọ,’ na-asịkwa banyere obodo niile nke Juda, ‘A ga-ewughachi ha,’ banyere mkpọmkpọ ebe ha niile, ‘Aga m ewulikwa ha.’
Isaiah 44:26 in English
Isaiah 44:26 · Berean Standard Bible
who confirms the message of His servant and fulfills the counsel of His messengers, who says of Jerusalem, ‘She will be inhabited,’ and of the cities of Judah, ‘They will be rebuilt, and I will restore their ruins,’
Context
24“Otu a, Onyenwe anyị na-ekwu,
Onye mgbapụta unu, onye ahụ kpụrụ unu nʼime afọ:
Mụ onwe bụ Onyenwe anyị,
Onye kere ihe niile,
onye gbatipụrụ eluigwe,
onye gbasara ụwa naanị mụ onwe m, 25onye na-emebi ihe ịrịbama niile nke ndị amụma ụgha
na-emekwa ka ndị na-ajụta ase ghọọ ndị nzuzu,
onye na-ekpu ihe ọmụmụ ndị maara ihe ihu nʼala
tụgharịa ya, ha ghọọ ihe nzuzu, 26onye na-eme ka okwu ndị ohu ya mezuo
meekwa ka amụma ndị ozi ya buru mezuo,
onye na-asị banyere Jerusalem, ‘A ga-ebikwa nʼime ya ọzọ,’
na-asịkwa banyere obodo niile nke Juda, ‘A ga-ewughachi ha,’
banyere mkpọmkpọ ebe ha niile, ‘Aga m ewulikwa ha.’ 27Onye ahụ na-asị, ogbu mmiri, ‘Takọrọ,
aga m emekwa ka iyi ya niile takọrọsịa,’ 28Onye na-asị banyere Sairọs, ‘Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m,
ọ ga-emezukwa ihe niile na-adị m mma;
Ọ ga-asịkwa banyere Jerusalem, “Ka ewugharịa ya,”
ma banyere ụlọnsọ, “Ka ehiwe ntọala ya.” ’
44:2 Maọbụ, Izrel
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.