Aịzaya 42:14
Isaiah 42:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ dịla anya kemgbe m gbara nkịtị; ejidesịrị m onwe m aka ike. Ma ugbu a, aga m egosi iwe m; aga m asụ ude, kwaa akwa dị ka nwanyị ime na-eme.
Isaiah 42:14 in English
Isaiah 42:14 · Berean Standard Bible
“I have kept silent from ages past; I have remained quiet and restrained. But now I will groan like a woman in labor; I will at once gasp and pant.
Context
12Ka ha nye Onyenwe anyị ebube,
kpọsaakwa otuto ya nʼala niile mmiri gbara gburugburu. 13Onyenwe anyị ga-apụta buo agha dịka dike.
Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke onye agha ka ọ ga-eji buo agha.
Ọ ga-eti mkpu agha megide ndị iro ya,
ma merie ha. 14“Ọ dịla anya kemgbe m gbara nkịtị;
ejidesịrị m onwe m aka ike.
Ma ugbu a, aga m egosi iwe m;
aga m asụ ude, kwaa akwa dị ka nwanyị ime na-eme. 15Aga m eme ka ugwu ukwu na ugwu nta niile dị larịị,
meekwa ka ihe ọkụkụ ha niile kpọnwụọ.
Aga m eme ka osimiri ghọọ ọzara,
meekwa ka ọdọ mmiri niile takpọọ. 16Aga m edu ndị kpuru ìsì, site nʼụzọ nke ha na-amaghị,
nʼokporoụzọ ha agatụbeghị ka m ga-edu ha;
Aga m eme ka ọchịchịrị ghọọ ìhè nʼihu ha,
meekwa ka ebe niile gbagọrọ agbagọ guzozie.
Ihe ndị a niile ka m ga-eme.
Agaghị m agbakụta ha azụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.