Aịzaya 37:4
Isaiah 37:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ nke Rabashaka, bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.”
Isaiah 37:4 in English
Isaiah 37:4 · Berean Standard Bible
Perhaps the LORD your God will hear the words of the Rabshakeh, whom his master the king of Assyria has sent to defy the living God, and He will rebuke him for the words that the LORD your God has heard. Therefore lift up a prayer for the remnant that still survives.”
Context
2O zipụrụ Eliakịm, onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz. 3Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya. 4Ma eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ nke Rabashaka, bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.” 5Mgbe ndị ọrụ eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya, 6ọ sịrị ha, “Otu a ka unu ga-asị nna unu ukwu, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: Atụla egwu nʼihi okwu niile nke ị nụrụ, bụ nke ndị na-ejere eze Asịrịa ozi ji kwuluo m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.