Aịzaya 36:13
Isaiah 36:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu niile nke eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa.
Isaiah 36:13 in English
Isaiah 36:13 · Berean Standard Bible
Then the Rabshakeh stood and called out loudly in Hebrew: “Hear the words of the great king, the king of Assyria!
Context
11Mgbe ahụ Eliakịm, Shebna na Joa sịrị ọchịagha ahụ, “Biko, gwa ndị ohu gị okwu nʼasụsụ Aramaik,* ebe ọ bụ na anyị na-aghọta ya. Agwala anyị okwu nʼasụsụ Hibru, ebe ndị nọ nʼelu mgbidi ga-anụ.” 12Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?” 13Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu niile nke eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa. 14Nke a bụ ihe eze sịrị, Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu. 15Unu ekwela ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Onyenwe anyị obi, mgbe ọ na-asị, ‘Nʼezie, Onyenwe anyị aghaghị ịnapụta anyị. A gaghị enyefe obodo a nʼaka eze Asịrịa.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.