Aịzaya 24:2
Isaiah 24:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu ihe ahụ ka ọ ga-eme mmadụ niile, nye ndị nchụaja ma ndị mmadụ, nye ụmụodibo na ndị nwe ha, nye ndị odibo nwanyị, na nne ha ukwu, nye ndị na-azụ ihe a na-ere ere, na ndị na-ere ihe orire; nye ndị na-ebinye ego, na ndị a na-ebinye ego; nye ndị ji ụgwọ, na ndị e ji ụgwọ.
Isaiah 24:2 in English
Isaiah 24:2 · Berean Standard Bible
people and priest alike, servant and master, maid and mistress, buyer and seller, lender and borrower, creditor and debtor.
Context
1Lee, na Onyenwe anyị na-aga ịgba ụwa ọtọ.
Ọ na-aga ime ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
Ọ na-aga ibibicha ihe dị nʼelu ụwa,
mee ka ndị bi nʼime ya gbasasịa. 2Otu ihe ahụ ka ọ ga-eme mmadụ niile,
nye ndị nchụaja ma ndị mmadụ,
nye ụmụodibo na ndị nwe ha,
nye ndị odibo nwanyị, na nne ha ukwu,
nye ndị na-azụ ihe a na-ere ere, na ndị na-ere ihe orire;
nye ndị na-ebinye ego, na ndị a na-ebinye ego;
nye ndị ji ụgwọ, na ndị e ji ụgwọ. 3O nweghị onye ọ ga-ahapụ.
A ga-agba ala ahụ ọtọ kwakọrọ ihe niile dị nʼime ya.
Nke a ka Onyenwe anyị kwuru. 4Ala atakọchaala, ma kpọnwụọ.
Ụwa ahụjuola anya ma kpọnwụọ.
Eluigwe na nʼụwa so na-ahụjukwa anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.