Aịzaya 17:3
Isaiah 17:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebe e wusiri ike nke Ifrem agaghị adịkwa, ya na ike alaeze nke sị Damaskọs, ndị fọdụrụ nke Aram ga-adị ka ebube nke ndị Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
Isaiah 17:3 in English
Isaiah 17:3 · Berean Standard Bible
The fortress will disappear from Ephraim,* and the sovereignty from Damascus. The remnant of Aram will be like the splendor of the Israelites,” declares the LORD of Hosts.
Context
1Nke a bụ amụma megide Damaskọs,* isi obodo Siria.
“Lee, Damaskọs agaghị adịkwa! Ọ gaghị abụkwa obodo ọzọ,
kama ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke zedara ezeda. 2Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime nʼobodo niile nke Aroea,
ọ ga-adịrị igwe atụrụ na ehi dị iche iche, ndị ga-amakpu,
ọ dịkwaghị onye ga-eme ka egwu tụọ ha nʼebe ahụ. 3Ebe e wusiri ike nke Ifrem agaghị adịkwa,
ya na ike alaeze nke sị Damaskọs,
ndị fọdụrụ nke Aram ga-adị ka
ebube nke ndị Izrel,”
otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. 4“Nʼụbọchị ahụ, a ga-eme ka nsọpụrụ Jekọb nwere bụrụ ihe e wedara nʼala.
Abụba dịkwa ya nʼahụ ga-atalata. 5Ọ ga-adị ka ubi e si nʼime ya wee ihe mkpụrụ site nʼọka guzoro ọtọ,
na-achịkọta mkpụrụ nʼogwe aka ha
dịka mgbe mmadụ na-atụtụkọta mkpụrụ site nʼigbo ọka
nʼime Ndagwurugwu Refaim.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.