Aịzaya 14:30
Isaiah 14:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị bụ nnọọ ogbenye ga-achọta ihe oriri, ndị mkpa na-akpa ga-ebikwa nʼudo. Ma aga m eji agụụ na ụnwụ laa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti unu nʼiyi.
Isaiah 14:30 in English
Isaiah 14:30 · Berean Standard Bible
Then the firstborn of the poor will find pasture, and the needy will lie down in safety, but I will kill your root by famine, and your remnant will be slain.
Context
28Amụma a bịara nʼafọ ahụ eze Ehaz nwụrụ: 29Unu aṅụrịla ọṅụ, unu ndị Filistia,
maka na mkpọrọ e ji eti unu ihe agbajiela;
Ọ bụ ezie na ọ gbajiela, ma ihe ga-esite nʼọdụdụ agwọ ahụ pụta bụ ajụala,
mkpụrụ ya ga-abụ agwọ ọjọọ, nke na-amagharị ebe niile. 30Ndị bụ nnọọ ogbenye ga-achọta ihe oriri,
ndị mkpa na-akpa ga-ebikwa nʼudo.
Ma aga m eji agụụ na ụnwụ
laa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti unu nʼiyi. 31Kwasie akwa ike gị ọnụ ụzọ ama! Tie mkpu gị obodo!
Tụọnụ oke egwu unu ndị Filistia.
Nʼihi na lee, ndị agha a zụziri azụzi si nʼugwu na-abịa imegide gị.
Ọ dịghị onye na-aga iche nʼetiti ahịrị ha. 32Ọsịsa dị aṅaa ka anyị ga-enye
ndị ozi si na mba ahụ?
Gwa ha na Onyenwe anyị emeela ka Zayọn guzosie ike.
Ọ bụkwa nʼime ya ka ndị ya e wedara nʼala ga-achọtara onwe ha ebe mgbaba.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.