Aịzaya 11:3
Isaiah 11:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị. Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ, maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya.
Isaiah 11:3 in English
Isaiah 11:3 · Berean Standard Bible
And He will delight in the fear of the LORD. He will not judge by what His eyes see, and He will not decide by what His ears hear,
Context
1Ome ga-epupụta site nʼogwe osisi Jesi;
otu Alaka ga-esitekwa na mgbọrọgwụ ya tolite ga-amịkwa mkpụrụ. 2Mmụọ Onyenwe anyị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya,
inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta,
Mmụọ ndụmọdụ na ike,
Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu Onyenwe anyị. 3Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị.
Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ,
maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya. 4Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe;
ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa.
Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ,
ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ. 5Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume,
ma ikwesi ntụkwasị obi ga-abụ ihe okike ukwu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.