Ndị Hibru 8:9
Hebrews 8:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha anọgideghị bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi idebe ọgbụgba ndụ m. Nʼihi ya, echepụrụ ihu m nʼebe ha nọ, ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Hebrews 8:9 in English
Hebrews 8:9 · Berean Standard Bible
It will not be like the covenant I made with their fathers when I took them by the hand to lead them out of the land of Egypt, because they did not abide by My covenant, and I disregarded them, declares the Lord.
Context
7Ọ bụrụ na ọgbụgba ndụ ochie ahụ zuruoke, ọ garaghị aba uru ka achọwa ọgbụgba ndụ ọzọ. 8Ma Chineke chọpụtara ezughị oke ha mgbe ọ sịrị,
“Lee, oge na-abịa, ka Onyenwe anyị kwupụtara,
mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ
dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,
nakwa ụlọ Juda. 9Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ
mụ na nna nna ha gbara,
mgbe m jidere ha nʼaka
site nʼala Ijipt dupụta ha,
nʼihi na ha anọgideghị bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi idebe ọgbụgba ndụ m.
Nʼihi ya, echepụrụ ihu m nʼebe ha nọ,
ka Onyenwe anyị kwupụtara. 10Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ m ga-eme ka ọ dịrị nʼetiti mụ onwe m na ụlọ Izrel,
mgbe oge ndị ahụ gasịrị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Aga m etinye iwu m nʼime uche ha,
dekwasị ya nʼobi ha.
Aga m abụ Chineke ha,
ha onwe ha ga-abụkwa ndị m. 11Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,
maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’
nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,
site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.