Ndị Hibru 7:15
Hebrews 7:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E meela ka a ghọta okwu anyị na-ekwu nke ọma, mgbe onye nchụaja ọzọ yiri Melkizedek pụtara.
Hebrews 7:15 in English
Hebrews 7:15 · Berean Standard Bible
And this point is even more clear if another priest like Melchizedek appears,
Context
13Nʼihi na onye ahụ e kwuru ihe ndị a banyere ya sitere nʼagbụrụ ọzọ, nke ọ dịbeghị onye ọbụla sitere na ya rụrụ ọrụ dị nʼebe ịchụ aja. 14Ọ bụ ihe a mara nke ọma na Onyenwe anyị si nʼagbụrụ Juda pụta, Mosis nʼonwe ya akpọtụghị agbụrụ ahụ aha mgbe ọ na-ekwu banyere ndị nchụaja. 15E meela ka a ghọta okwu anyị na-ekwu nke ọma, mgbe onye nchụaja ọzọ yiri Melkizedek pụtara. 16Onye ghọrọ onye nchụaja ma ọ bụghị site nʼusoro iwu nke ọmụmụ ndị nchụaja, kama site nʼike dị na ndụ nke na-apụghị ịla nʼiyi. 17Nʼihi na-agbara akaebe banyere ya, sị,
“Gị onwe gị, bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi,
dị ka usoro Melkizedek si dị.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.