Ndị Hibru 5:10
Hebrews 5:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebe Chineke mere ya onyeisi nchụaja nʼusoro Melkizedek.
Hebrews 5:10 in English
Hebrews 5:10 · Berean Standard Bible
and was designated by God as high priest in the order of Melchizedek.
Context
8Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara ma ọ mụtara irube isi site nʼahụhụ ọ tara. 9Ma mgbe e mere ka o zuo oke, ọ ghọrọ isi nke nzọpụta ebighị ebi nye ndị niile na-erubere ya isi. 10Ebe Chineke mere ya onyeisi nchụaja nʼusoro Melkizedek. 11Ọ dị ọtụtụ ihe ọzọ anyị nwere ikwu banyere ya, ma o siri ike ịkọwa ya nʼihi na unu adịghị amụta ihe ọsịịsọ. 12Nʼezie, ugbu a, unu kwesiri ịbụ ndị ozizi nye ndị ọzọ, ma unu ka nọ na-achọ onye ga-ezikwa unu ụkpụrụ mbụ nke okwu Chineke. Unu na-achọ mmiri ara kama nri siri ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.