Ndị Hibru 2:5
Hebrews 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu banyere ụwa gaje ịbịa abịa.
Hebrews 2:5 in English
Hebrews 2:5 · Berean Standard Bible
For it is not to angels that He has subjected the world to come, about which we are speaking.
Context
3Anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara oke nzọpụta ahụ anya? Ọ bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya, bụkwa nke ndị nụrụ ya gbaara anyị ama banyere ya. 4Chineke nʼonwe ya tụkwasịrị ịgba ama nke ya, site nʼịrụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama, na ọrụ ịtụnanya dị iche iche, nakwa ikesa ọtụtụ onyinye nke Mmụọ Nsọ, dị ka ọchịchọ ya siri dị. 5Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu banyere ụwa gaje ịbịa abịa. 6Otu onye agbaala akaebe nʼebe ọzọ,
“Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha?
Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ iji na-elekọta ya? 7Nʼihi na i mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ;
i jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.