Ndị Hibru 2:13
Hebrews 2:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọkwa, “Aga m atụkwasị obi m na ya.”* Ọzọkwa, ọ sịrị, “Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Chineke nyere m.”*
Hebrews 2:13 in English
Hebrews 2:13 · Berean Standard Bible
And again: “I will put My trust in Him.”* And once again: “Here am I, and the children God has given Me.”*
Context
11Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya. 12Ọ sịrị,
“Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m,
nʼetiti nzukọ ka m ga-anọ bụọrọ gị abụ otuto.”* 13Ọzọkwa,
“Aga m atụkwasị obi m na ya.”*
Ọzọkwa, ọ sịrị,
“Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Chineke nyere m.”* 14Ebe ọ bụ na ụmụ ndị ahụ ketara oke na anụ ahụ na ọbara, ya onwe ya sooro ha keta oke nʼụdịdị ahụ, ka o site nʼọnwụ ya laa onye ahụ nwere ike ọnwụ nʼiyi, onye ahụ bụ ekwensu. 15Ma tọpụ ndị ahụ niile egwu nke ọnwụ mere ka ha bụrụ ohu na ndụ ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.