Native Bible

Hebrews 12:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

na ụda opi ike, maọbụ olu na-ekwu okwu, nke ndị nụrụ ya rịọrọ ka ọ kwụsị ịgwa ha.

Hebrews 12:19 in English

Hebrews 12:19 · Berean Standard Bible

to a trumpet blast or to a voice that made its hearers beg that no further word be spoken.

Context

17Dịka unu maara, o mechara chọọ ka o keta ngọzị ahụ, ma a jụrụ ya nʼihi na o nweghị ohere nchegharị. Ọ bụ ezie na o jiri anya mmiri chọsie ya ike. 18Unu abịarughị nʼugwu nke a pụrụ ịmetụ aka, nke na-ere ọkụ, na ọchịchịrị na itiri na oke ifufe, 19na ụda opi ike, maọbụ olu na-ekwu okwu, nke ndị nụrụ ya rịọrọ ka ọ kwụsị ịgwa ha. 20Nʼihi na ha enweghị ike ịnagide ihe e nyere nʼiwu, “A sịkwarị na anụmanụ ọbụla emetụ ugwu ahụ ahụ, a ga-eji nkume tugbuo ya.”* 21Nʼezie, ihe ahụ anya hụrụ dị oke egwu na Mosis sịrị, “Ana m ama jijiji nʼihi ụjọ.”*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.