Native Bible

Hebrews 12:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka unu maara, o mechara chọọ ka o keta ngọzị ahụ, ma a jụrụ ya nʼihi na o nweghị ohere nchegharị. Ọ bụ ezie na o jiri anya mmiri chọsie ya ike.

Hebrews 12:17 in English

Hebrews 12:17 · Berean Standard Bible

For you know that afterward, when he wanted to inherit the blessing, he was rejected. He could find no ground for repentance, though he sought the blessing with tears.

Context

15Hụkwanụ na o nweghị onye ga-ahapụ inweta amara Chineke, na o nwekwaghị onye ga-epupụta dịka mgbọrọgwụ ilu weta nsogbu a ga-esi nʼime ya merụọ ọtụtụ mmadụ. 16Hụnụ na o nweghị onye na-ebi ndụ ruru unyi maọbụ onye nke na-enweghị nsọpụrụ dịka Ịsọ, onye nke rere ọnọdụ ọmụmụ ya nʼihi otu efere nri. 17Dịka unu maara, o mechara chọọ ka o keta ngọzị ahụ, ma a jụrụ ya nʼihi na o nweghị ohere nchegharị. Ọ bụ ezie na o jiri anya mmiri chọsie ya ike. 18Unu abịarughị nʼugwu nke a pụrụ ịmetụ aka, nke na-ere ọkụ, na ọchịchịrị na itiri na oke ifufe, 19na ụda opi ike, maọbụ olu na-ekwu okwu, nke ndị nụrụ ya rịọrọ ka ọ kwụsị ịgwa ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.