Ndị Hibru 10:7
Hebrews 10:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ ka m sịrị, ‘Lee, abịala m Chineke m, ime ihe ị na-achọ. Nke a bụkwa ihe e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.’ ”*
Hebrews 10:7 in English
Hebrews 10:7 · Berean Standard Bible
Then I said, ‘Here I am, it is written about Me in the scroll: I have come to do Your will, O God.’”*
Context
5Ya mere mgbe Kraịst bịara nʼụwa, ọ sịrị,
“Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ
kama ị kwadoro ahụ nye m. 6Aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie,
ha abụghị ihe dị ezi mma nye gị. 7Mgbe ahụ ka m sịrị, ‘Lee, abịala m Chineke m, ime ihe ị na-achọ.
Nke a bụkwa ihe e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.’ ”* 8O kwuru na mbụ, “Aja dị iche iche, na onyinye, na aja nsure ọkụ na aja mmehie adịghị atọ gị ụtọ, ha adịghịkwa amasị gị” (a chụrụ aja ndị a dịka iwu si dị). 9O kwukwara ọzọ, “Lee abịala m ime uche gị.” Ọ kagburu aja nke mbụ ahụ ma were aja nke abụọ dochie nʼọnọdụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.