Hegai 2:5
Haggai 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
‘Nke a bụ ihe merenụ mgbe mụ na unu gbara ndụ nʼoge ahụ unu si nʼIjipt pụta. Mmụọ m na-anọgidekwa nʼetiti unu. Unu atụla egwu.’
Haggai 2:5 in English
Haggai 2:5 · Berean Standard Bible
This is the promise I made to you when you came out of Egypt. And My Spirit remains among you; do not be afraid.”
Context
3‘Onye nʼime unu nwere ike icheta otu ụlọnsọ ukwu nke mbụ si dị ebube? Ọ dị aṅaa nʼanya unu ugbu a? Ọ bụ na ọ dịghị unu ka ihe efu ugbu a. 4Ma ugbu a nwee obi ike Zerubabel,’ ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Nwekwaa obi ike gị Joshua onyeisi nchụaja, nwa Jehozadak. Nwekwaanụ obi ike unu ndị niile bi nʼala a.’ Ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Rụọnụ ọrụ nʼihi na anọnyeere m unu,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. 5‘Nke a bụ ihe merenụ mgbe mụ na unu gbara ndụ nʼoge ahụ unu si nʼIjipt pụta. Mmụọ m na-anọgidekwa nʼetiti unu. Unu atụla egwu.’ 6“Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ fọdụrụ otu ugbo, nwa oge nta gasịa, aga m ayọgharị eluigwe na ụwa, na osimiri na ala akọrọ. 7Aga m ayọgharịkwa mba niile; ihe mba niile na-achọsi ike ga-abịa. Aga m eme ka ụlọ a jupụta nʼebube,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.