Native Bible

Haggai 2:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ugbu a nwee obi ike Zerubabel,’ ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Nwekwaa obi ike gị Joshua onyeisi nchụaja, nwa Jehozadak. Nwekwaanụ obi ike unu ndị niile bi nʼala a.’ Ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Rụọnụ ọrụ nʼihi na anọnyeere m unu,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.

Haggai 2:4 in English

Haggai 2:4 · Berean Standard Bible

But now be strong, O Zerubbabel, declares the LORD. Be strong, O Joshua son of Jehozadak, the high priest. And be strong, all you people of the land, declares the LORD. Work! For I am with you, declares the LORD of Hosts.

Context

2“Gwa Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị Izrel ahụ fọdụrụ nʼala ahụ sị: 3‘Onye nʼime unu nwere ike icheta otu ụlọnsọ ukwu nke mbụ si dị ebube? Ọ dị aṅaa nʼanya unu ugbu a? Ọ bụ na ọ dịghị unu ka ihe efu ugbu a. 4Ma ugbu a nwee obi ike Zerubabel,’ ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Nwekwaa obi ike gị Joshua onyeisi nchụaja, nwa Jehozadak. Nwekwaanụ obi ike unu ndị niile bi nʼala a.’ Ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Rụọnụ ọrụ nʼihi na anọnyeere m unu,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. 5‘Nke a bụ ihe merenụ mgbe mụ na unu gbara ndụ nʼoge ahụ unu si nʼIjipt pụta. Mmụọ m na-anọgidekwa nʼetiti unu. Unu atụla egwu.’ 6“Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ fọdụrụ otu ugbo, nwa oge nta gasịa, aga m ayọgharị eluigwe na ụwa, na osimiri na ala akọrọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.