Hegai 2:21
Haggai 2:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gwa Zerubabel, onye na-achị Juda sị ana m aga ịyọgharị eluigwe na ụwa.
Haggai 2:21 in English
Haggai 2:21 · Berean Standard Bible
“Tell Zerubbabel governor of Judah that I am about to shake the heavens and the earth:
Context
19Ọ ka nwere mkpụrụ ọghịgha unu nwere nʼọba unu? Ọzọkwa, osisi vaịnị, osisi fiig, osisi pomegranet na osisi oliv amịghị mkpụrụ, ruo ugbu a.
“ ‘Ma site nʼụbọchị taa gaa nʼihu aga m agọzi unu.’ ” 20Okwu Onyenwe anyị bịakwutere Hegai nke ugboro abụọ, nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa ahụ, sị, 21“Gwa Zerubabel, onye na-achị Juda sị ana m aga ịyọgharị eluigwe na ụwa. 22Aga m akwatu ocheeze alaeze dị iche iche, ana m agakwa imebi ike alaeze nke mba dị iche iche. Aga m akwatu ụgbọ ịnyịnya nʼala na ndị na-anya ha; ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-adakwa. Onye ọbụla ga-adakwa site na mma agha nke onye otu ya. 23“ ‘Nʼụbọchị ahụ,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, ‘Aga m ewere gị bụ onyeozi m Zerubabel nwa Shealtiel,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ‘mee gị ka ị dị ka mgbaaka akara m, nʼihi na ahọrọla m gị,’ Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.