Native Bible

Haggai 1:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Unu na-ele anya ihe ukwu, ma lee, ọ bụ naanị ihe ntakịrị ka ọ pụtara. Mgbe unu welatara ha nʼụlọ, a fụfụsiri m ha niile. Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. “Ọ bụ nʼihi na ụlọnsọ ukwu m, nke nọgidere na-abụ mkpọmkpọ ebe, ma onye ọbụla nʼime unu na-agba mbọ ịrụ naanị ihe gbasara ụlọ nke aka ya.

Haggai 1:9 in English

Haggai 1:9 · Berean Standard Bible

You expected much, but behold, it amounted to little. And what you brought home, I blew away. Why? declares the LORD of Hosts. Because My house still lies in ruins, while each of you is busy with his own house.

Context

7Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Chezienụ echiche banyere ndụ unu. 8Jeenụ nʼelu ugwu, wedata osisi, jiri ya wuo ụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe ahụ, obi ga-atọ m ụtọ na ya, a ga-asọpụkwara m nʼebe ahụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru. 9“Unu na-ele anya ihe ukwu, ma lee, ọ bụ naanị ihe ntakịrị ka ọ pụtara. Mgbe unu welatara ha nʼụlọ, a fụfụsiri m ha niile. Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. “Ọ bụ nʼihi na ụlọnsọ ukwu m, nke nọgidere na-abụ mkpọmkpọ ebe, ma onye ọbụla nʼime unu na-agba mbọ ịrụ naanị ihe gbasara ụlọ nke aka ya. 10Ya mere, nʼihi unu ka eluigwe ji jide igirigi ha, ala ejidekwala ihe omume nke ubi. 11Akpọọla m ka okpomọkụ bịakwasị nʼala ubi niile nakwa nʼelu ugwu niile, nʼelu ọka na mmanya ọhụrụ, mmanụ oliv na ihe niile nke ala na-emepụta. Ka ọ bịakwasị mmadụ na anụmanụ niile, nakwa ihe niile unu dọgburu onwe unu nʼọrụ inweta.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.