Native Bible

Haggai 1:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, nʼihi unu ka eluigwe ji jide igirigi ha, ala ejidekwala ihe omume nke ubi.

Haggai 1:10 in English

Haggai 1:10 · Berean Standard Bible

Therefore, on account of you the heavens have withheld their dew and the earth has withheld its crops.

Context

8Jeenụ nʼelu ugwu, wedata osisi, jiri ya wuo ụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe ahụ, obi ga-atọ m ụtọ na ya, a ga-asọpụkwara m nʼebe ahụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru. 9“Unu na-ele anya ihe ukwu, ma lee, ọ bụ naanị ihe ntakịrị ka ọ pụtara. Mgbe unu welatara ha nʼụlọ, a fụfụsiri m ha niile. Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. “Ọ bụ nʼihi na ụlọnsọ ukwu m, nke nọgidere na-abụ mkpọmkpọ ebe, ma onye ọbụla nʼime unu na-agba mbọ ịrụ naanị ihe gbasara ụlọ nke aka ya. 10Ya mere, nʼihi unu ka eluigwe ji jide igirigi ha, ala ejidekwala ihe omume nke ubi. 11Akpọọla m ka okpomọkụ bịakwasị nʼala ubi niile nakwa nʼelu ugwu niile, nʼelu ọka na mmanya ọhụrụ, mmanụ oliv na ihe niile nke ala na-emepụta. Ka ọ bịakwasị mmadụ na anụmanụ niile, nakwa ihe niile unu dọgburu onwe unu nʼọrụ inweta.” 12Mgbe ahụ, Zerubabel nwa Shealtiel, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị niile fọdụrụ, ṅara ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke ha, na nʼozi Hegai onye amụma, dịka Onyenwe anyị Chineke ha zitere ya. Ndị Izrel niile tụkwara egwu Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.