Native Bible

Haggai 1:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ Hegai, onyeozi Onyenwe anyị, ziri ndị mmadụ ahụ niile ozi Onyenwe anyị, sị: “Mụ onwe m nọnyeere unu,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Haggai 1:13 in English

Haggai 1:13 · Berean Standard Bible

Haggai, the messenger of the LORD, delivered the message of the LORD to the people: “I am with you,” declares the LORD.

Context

11Akpọọla m ka okpomọkụ bịakwasị nʼala ubi niile nakwa nʼelu ugwu niile, nʼelu ọka na mmanya ọhụrụ, mmanụ oliv na ihe niile nke ala na-emepụta. Ka ọ bịakwasị mmadụ na anụmanụ niile, nakwa ihe niile unu dọgburu onwe unu nʼọrụ inweta.” 12Mgbe ahụ, Zerubabel nwa Shealtiel, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị niile fọdụrụ, ṅara ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke ha, na nʼozi Hegai onye amụma, dịka Onyenwe anyị Chineke ha zitere ya. Ndị Izrel niile tụkwara egwu Onyenwe anyị. 13Mgbe ahụ Hegai, onyeozi Onyenwe anyị, ziri ndị mmadụ ahụ niile ozi Onyenwe anyị, sị: “Mụ onwe m nọnyeere unu,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 14Ya mere, Onyenwe anyị kwaliri mmụọ Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na mmụọ Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja na mmụọ ndị niile ahụ fọdụrụ nʼala ahụ. Ha niile bịara bido ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke ha, 15nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nʼọnwa nke isii.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.