Jenesis 9:5
Genesis 9:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma gbasara ọbara ndụ unu, unu ga-asara ọnụ unu nʼihu m. Anụmanụ ọbụla ga-asara ọnụ ya nʼihu m. Mmadụ ọbụla kwa ga-asara ọnụ ya nʼihu m banyere ndụ mmadụ ibe ya.
Genesis 9:5 in English
Genesis 9:5 · Berean Standard Bible
And surely I will require the life of any man or beast by whose hand your lifeblood is shed. I will demand an accounting from anyone who takes the life of his fellow man:
Context
3Ihe ọbụla dị ndụ nke na-ejegharị ejegharị ga-abụ nri unu. Enyela m unu ihe niile ugbu a dịka m si nye unu ahịhịa ndụ niile. 4“Ma unu agaghị eri anụ ọbụla nke ọbara ndụ ya dị ya nʼahụ. 5Ma gbasara ọbara ndụ unu, unu ga-asara ọnụ unu nʼihu m. Anụmanụ ọbụla ga-asara ọnụ ya nʼihu m. Mmadụ ọbụla kwa ga-asara ọnụ ya nʼihu m banyere ndụ mmadụ ibe ya. 6“Onye ọbụla wufuru ọbara mmadụ,
nʼaka mmadụ ka a ga-awụfu ọbara nke ya,
nʼihi nʼoyiyi Chineke
ka Chineke mere mmadụ. 7Ma unu onwe unu, mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ ụwa, baakwanụ ụba nʼime ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.