Jenesis 6:2
Genesis 6:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ka ụmụ ndị ikom Chineke bidoro ilekwasị ụmụ ndị inyom ndị mmadụ anya, hụ na ha mara mma. Ha duuru ndị inyom ọbụla masịrị ha ka ha bụrụ nwunye ha.
Genesis 6:2 in English
Genesis 6:2 · Berean Standard Bible
the sons of God saw that the daughters of men were beautiful, and they took as wives whomever they chose.
Context
1Mgbe ndị mmadụ bidoro mụbaa nʼụwa, mgbe a mụtakwaara ha ọtụtụ ụmụ ndị inyom, 2ka ụmụ ndị ikom Chineke bidoro ilekwasị ụmụ ndị inyom ndị mmadụ anya, hụ na ha mara mma. Ha duuru ndị inyom ọbụla masịrị ha ka ha bụrụ nwunye ha. 3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mmụọ m na mmadụ agaghị anọgide nʼịgba mgba nʼime mmadụ ruo ebighị ebi, nʼihi na mmadụ efu ka ọ bụ.* Ọnụọgụgụ ndụ ya ga-abụ narị afọ na iri afọ abụọ.” 4Ndị Nefilim nọ nʼụwa nʼoge ahụ, ma nʼoge sotere ya mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom Chineke na-abakwuru ndị inyom ụmụ mmadụ, site na mmekọrịta dị otu a mụọ ụmụ. Ndị a bụ ndị dike mgbe ochie ahụ, ndị a ma ama.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.