Native Bible

Genesis 49:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, o nyere ha ndụmọdụ sị ha, “Nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, aga m anwụ. Unu aghaghị ili m nʼebe e liri nna m ha, nʼala Kenan, nʼime ọgba ahụ dị nʼọhịa Efrọn, onye Het.

Genesis 49:29 in English

Genesis 49:29 · Berean Standard Bible

Then Jacob instructed them, “I am about to be gathered to my people. Bury me with my fathers in the cave in the field of Ephron the Hittite.

Context

27“Benjamin dịka nkịta ọhịa nke na-adọgbu anụ. Nʼụtụtụ, ọ na-eri anụ ọ dọgburu. Nʼanyasị ọ na-ekesakwa ihe o gbutere.” 28Ndị a bụ ebo iri na abụọ dị nʼIzrel. Ihe ndị a bụkwa ihe nna ha gwara ha mgbe ọ gọziri ha, nye onye ọbụla nʼime ha ngọzị nke ruuru ya. 29Emesịa, o nyere ha ndụmọdụ sị ha, “Nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, aga m anwụ. Unu aghaghị ili m nʼebe e liri nna m ha, nʼala Kenan, nʼime ọgba ahụ dị nʼọhịa Efrọn, onye Het. 30Nʼime ọgba dị nʼọhịa Makipela, nke dị nso na Mamre, nʼala Kenan, ọhịa Ebraham zụtara site nʼaka Efrọn onye Het, maka ili ozu. 31Nʼebe ahụ ka e liri Ebraham na Sera nwunye ya. Nʼebe ahụ kwa ka e liri Aịzik na Ribeka nwunye ya. Nʼebe ahụ ka m liri Lịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.