Native Bible

Genesis 47:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Fero jụrụ Jekọb sị, “Ị gbaala afọ ole ugbu a?”

Genesis 47:8 in English

Genesis 47:8 · Berean Standard Bible

“How many years have you lived?” Pharaoh asked.

Context

6Ala Ijipt dịkwa gị nʼihu. Họrọ ebe ọbụla masịrị gị nke dịkwa ezi mma nye nna gị na ụmụnne gị ka ha biri. Ka ha biri na Goshen. Ọ bụrụkwa na ị maara ndị ikom nʼetiti ha ndị nwere ike, mee ha ndị na-elekọta igwe anụ ụlọ m.” 7Josef kpọtara nna ya Jekọb, mee ka o guzo nʼihu Fero. Jekọb nọ nʼebe ahụ gọzie Fero. 8Fero jụrụ Jekọb sị, “Ị gbaala afọ ole ugbu a?” 9Jekọb zara Fero sị ya: “Ebiela m dịka onye ọbịa narị afọ na iri afọ atọ. Ọnụọgụgụ afọ ndị a ehighị nne, ma ha jupụtara nʼahụhụ na nsogbu. Ma a nọrubeghị m ọnụọgụgụ afọ nna m ha gbara mgbe ha biri nʼụwa dịka ọbịa.” 10Jekọb gọziri Fero, site nʼihu ya pụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.