Jenesis 47:5
Genesis 47:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Fero gwara Josef sị, “Nna gị na ụmụnne gị abịakwutela gị. Ha biri nʼala Goshen.
Genesis 47:5 in English
Genesis 47:5 · Berean Standard Bible
Pharaoh said to Joseph, “Now that your father and brothers have come to you,
Context
3Fero jụrụ ụmụnne ya ajụjụ sị ha, “Gịnị bụ ọrụ aka unu?”
Ha zara sị ya, “Ndị ohu gị bụ ndị ọzụzụ atụrụ dịka nna nna anyị ha.” 4Ha kwukwara sị, “Anyị bịara ịnọ dịka ọbịa nʼala a nʼihi na ụnwụ a siri oke ike nʼala Kenan. O nweghị nri igwe ewu na atụrụ anyị nwere iri nʼala ahụ. Ya mere, anyị na-arịọ ka i nye ndị ohu gị ike ka ha biri nʼala Goshen.” 5Fero gwara Josef sị, “Nna gị na ụmụnne gị abịakwutela gị. Ha biri nʼala Goshen. 6Ala Ijipt dịkwa gị nʼihu. Họrọ ebe ọbụla masịrị gị nke dịkwa ezi mma nye nna gị na ụmụnne gị ka ha biri. Ka ha biri na Goshen. Ọ bụrụkwa na ị maara ndị ikom nʼetiti ha ndị nwere ike, mee ha ndị na-elekọta igwe anụ ụlọ m.” 7Josef kpọtara nna ya Jekọb, mee ka o guzo nʼihu Fero. Jekọb nọ nʼebe ahụ gọzie Fero.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.