Jenesis 47:18
Genesis 47:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe afọ ahụ gafesịrị, ha bịakwutekwara ya nʼafọ nke ọzọ sị ya, “Anyị agaghị ezoro onyenwe anyị na ego anyị agwụla, na igwe anụ ụlọ anyị bụkwa nke gị. O nweghị ihe ọzọ fọdụrụ anyị karịa ahụ anyị na ala anyị.
Genesis 47:18 in English
Genesis 47:18 · Berean Standard Bible
When that year was over, they came to him the second year and said, “We cannot hide from our lord that our money is gone and all our livestock belongs to you. There is nothing left for our lord except our bodies and our land.
Context
16Mgbe ahụ Josef zara sị ha: “Jirinụ anụ ụlọ unu kwụọ ụgwọ nri m ga-enye unu, ebe ọ bụ na ego unu agwụla.” 17Ya mere, ha kpụtaara Josef anụ ụlọ ha. Josef nyere ha nri nʼọnọdụ ịnyịnya ha, na atụrụ ha, na ewu ha, na ehi, na ịnyịnya ibu ha. O were nri zụọ ha nʼafọ ahụ nʼọnọdụ anụ ụlọ ha niile. 18Mgbe afọ ahụ gafesịrị, ha bịakwutekwara ya nʼafọ nke ọzọ sị ya, “Anyị agaghị ezoro onyenwe anyị na ego anyị agwụla, na igwe anụ ụlọ anyị bụkwa nke gị. O nweghị ihe ọzọ fọdụrụ anyị karịa ahụ anyị na ala anyị. 19Gịnị mere anyị ga-eji nọọ nʼagụụ nʼihu gị? Zụrụ anyị na ala anyị nʼọnọdụ ụgwọ anyị ga-akwụ maka nri ị ga-enye anyị. Ka anyị na ala anyị bụrụ ndị ohu Fero. Nye anyị mkpụrụ ubi ka anyị dịrị ndụ ghara ịnwụ, ka ala a ghara ịbụ ihe tọgbọrọ nʼefu.” 20Ya mere, Josef zụtaara Fero ala Ijipt niile. Ndị Ijipt niile nʼotu nʼotu rere ala ha nʼihi oke ụnwụ ahụ dakwasịrị ha. Mgbe ahụ, ala ha niile ghọrọ nke Fero.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.